2 Unu ga-ebibicha+ ebe niile mba ndị unu na-anapụ ala ha na-anọ efe chi ha, ya bụ, n’ugwu dị elu na n’obere ugwu dị iche iche nakwa n’okpuru osisi ọ bụla jupụtara n’akwụkwọ ndụ.+
6 Jehova wee gwa m n’ụbọchị Josaya bụ́ eze, sị:+ “‘Ị̀ hụwo ihe Izrel na-ekwesịghị ntụkwasị obi mere?+ Ọ na-agbago n’ugwu ọ bụla dị elu,+ na-agakwa n’okpuru osisi ọ bụla jupụtara n’akwụkwọ ndụ,+ ka o wee gbaa akwụna n’ebe ahụ.+
13 Ha na-achụ àjà n’elu ugwu ukwu,+ ha na-esurekwa ihe nsure ọkụ n’elu ugwu nta dị iche iche,+ n’okpuru oké osisi na osisi stọraks na osisi ukwu, n’ihi na ndò ya dị mma.+ Ọ bụ ya mere ụmụ unu ndị inyom na ndị nwunye ụmụ unu ji na-akwa iko.