6 O gbughịkwa ụmụ ndị ahụ gburu ya, dị ka e dere n’akwụkwọ iwu Mozis, nke Jehova nyere n’iwu, sị:+ “A gaghị egbu ndị bụ́ nna n’ihi ụmụ ha, a gaghịkwa egbu ụmụ n’ihi nna ha; kama a ga-egbu onye nke ọ bụla n’ihi mmehie nke ya.”+
4 Lee! Mkpụrụ obi niile, ọ bụ m nwe ha.+ Ma mkpụrụ obi+ nke nna ma mkpụrụ obi nke nwa, ọ bụ m nwe ha.+ Mkpụrụ obi ọ bụla nke na-emehie,+ ọ bụ ya ga-anwụ.+