29 “Ị̀ hụwo otú Ehab si weda onwe ya ala n’ihi m?+ Ebe ọ bụ na o wedara onwe ya ala n’ihi m, agaghị m eweta ọdachi ahụ n’ụbọchị ya.+ Ọ bụ n’ụbọchị nwa ya ka m ga-eme ka ọdachi ahụ dakwasị ụlọ ya.”+
10 Ezi Chineke wee hụ ọrụ ha,+ na ha ahapụwo ụzọ ọjọọ ha;+ ezi Chineke wee gbanwee obi+ ya banyere ọdachi+ o kwuru na ya ga-ewetara ha; o wetaghịzi ya.