7 O wee ruo na n’ihi na ụmụ Izrel mehiere+ Jehova bụ́ Chineke ha, bụ́ onye kpọpụtara ha n’ala Ijipt n’aka Fero eze Ijipt,+ ha wee malite ịtụ egwu chi ọzọ;+
6 Jehova wee gwa m n’ụbọchị Josaya bụ́ eze, sị:+ “‘Ị̀ hụwo ihe Izrel na-ekwesịghị ntụkwasị obi mere?+ Ọ na-agbago n’ugwu ọ bụla dị elu,+ na-agakwa n’okpuru osisi ọ bụla jupụtara n’akwụkwọ ndụ,+ ka o wee gbaa akwụna n’ebe ahụ.+