28 N’ihi ya, ala ahụ ga-eru uju,+ eluigwe ga-agbakwa ọchịchịrị.+ Ọ bụ n’ihi na ekwuwo m ya, echebaworo m ya echiche, enweghịkwa m mwute, agaghịkwa m ala azụ n’ime ya.+
29 “Ozugbo mkpagbu nke ụbọchị ndị ahụ gasịrị, anyanwụ ga-agba ọchịchịrị,+ ọnwa+ agaghịkwa enye ìhè ya, kpakpando ga-esikwa n’eluigwe daa, a ga-emekwa ka ike nke eluigwe maa jijiji.+
25 “A ga-enwekwa ihe ịrịba ama dị iche iche n’anyanwụ+ na n’ọnwa nakwa na kpakpando, mba dị iche iche ga-anọkwa ná nhụjuanya n’elu ụwa, n’amaghị ihe ha ga-eme n’ihi mbigbọ nke oké osimiri+ na mmali+ ya,
2 O wee meghee olulu abis, anwụrụ ọkụ+ wee si n’olulu ahụ pụta dị ka anwụrụ ọkụ nke si ná nnukwu ekwú ọkụ,+ anwụrụ ọkụ nke si n’olulu ahụ mekwara ka anyanwụ na ikuku gbaa ọchịchịrị.+