17 M ga-eme ka ikpe ziri ezi bụrụ eriri e ji atụ̀ ihe,+ meekwa ka ezi omume+ bụrụ ihe ọ̀tụ̀tụ̀; akụ́ mmiri ígwé+ ga-ekpochapụ ebe mgbaba ụgha ha,+ mmiri ga-ebupụkwa ebe ahụ ha zoro.+
13 “Ya mere, nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘M ga-eji ọnụma m mee ka oké ifufe fee, n’iwe m ka oké mmiri ozuzo ga-ezo, n’ọnụma m ka akụ́ mmiri ígwé ga-ada iji weta mkpochapụ.+
26 “Mgbe izu iri isii na abụọ ahụ gasịrị, a ga-ebipụ Mesaya,+ ya agbara aka.+
“Ndị nke onye ndú ahụ na-abịanụ ga-ebibi+ obodo ahụ na ebe nsọ ahụ.+ Ọ bụkwa idei mmiri ka a ga-eji bibie ya. A ga na-alụ agha ruo ná ngwụsị; ihe e kpebiri bụ mbibi.+