25 Juda+ na Izrel wee na-ebi n’obi iru ala,+ onye ọ bụla n’okpuru osisi vaịn ya nakwa n’okpuru osisi fig ya,+ malite na Dan ruo Bia-shiba,+ n’ụbọchị niile nke Sọlọmọn.
16 Unu egela Hezekaya ntị, n’ihi na nke a bụ ihe eze Asiria kwuru: “Chịlierenụ m aka elu+ ma pụkwutenụ m, onye ọ bụla n’ime unu rie ihe si n’osisi vaịn ya na ihe si n’osisi fig ya,+ onye ọ bụla n’ime unu ṅụọkwa mmiri si n’olulu mmiri ya,+
18 Mụ na anụ ọhịa+ na anụ ufe nke eluigwe na ihe na-akpụ akpụ n’ala ga-agba ndụ n’ụbọchị ahụ n’ihi ha, m ga-emekwa ka ụta na mma agha na agha ghara ịdịkwa n’ala ha,+ m ga-emekwa ka ha dinara ala n’obi iru ala.+
4 Onye ọ bụla n’ime ha ga-anọdụ n’okpuru osisi vaịn ya nakwa n’okpuru osisi fig ya,+ ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji;+ n’ihi na ọnụ Jehova nke ụsụụ ndị agha ekwuwo ya.+