1 Ndị Eze
4 Eze Sọlọmọn wee bụrụ eze Izrel dum.+ 2 Ndị a bụ ndị o mere ndị isi:+ Azaraya nwa Zedọk+ bụ onye nchụàjà; 3 Elihoref na Ahaịja, ụmụ Shaịsha, bụ ndị odeakwụkwọ;+ Jehọshafat+ nwa Ahaịlọd bụ onye na-edekọ ihe; 4 Benaya+ nwa Jehoyada bụ onyeisi ndị agha,+ Zedọk na Abayata+ bụkwa ndị nchụàjà; 5 Azaraya nwa Netan+ bụ onyeisi ndị nnọchiteanya eze, Zebọd nwa Netan bụ onye nchụàjà, enyi+ eze; 6 Ahaịsha bụ onye nlekọta ụlọ eze, Adọnaịram+ nwa Abda bụkwa onyeisi ndị a kpọọrọ ịrụ ọrụ mmanye.+
7 Sọlọmọn nwere ndị nnọchiteanya iri na abụọ n’Izrel dum, ha na-ewetakwara eze na ezinụlọ ya nri. Ọ bụ ọrụ dịịrị onye nke ọ bụla iweta nri otu ọnwa n’afọ.+ 8 Aha ha bụ: Nwa Họọ, onye na-elekọta ógbè Ifrem bụ́ ugwu ugwu;+ 9 nwa Dika, onye na-elekọta obodo Mekaz nakwa na Shealbim+ na Bet-shimesh+ na Ilọn-bet-henan; 10 nwa Hised, onye na-elekọta Arọbọt (Ọ bụ ya nwe Soko na ala Hifa dum);+ 11 nwa Abinadab, onye na-elekọta ugwu dum nke Dọọ+ (Ọ bụ Tefat, bụ́ ada Sọlọmọn, ka ọ lụrụ); 12 Beana nwa Ahaịlọd, onye na-elekọta obodo Teanak+ na Megido+ na Bet-shian+ dum, nke dị n’akụkụ Zaretan+ na ndịda ndịda Jezril,+ malite na Bet-shian ruo Ebel-mehola,+ ruokwa n’ógbè Jọkmiam;+ 13 nwa Giba, onye na-elekọta Remọt-gilied+ (ọ bụ ya nwe obodo ụlọikwuu niile nke Jeya+ nwa Manase, bụ́ ndị dị na Gilied;+ ọ bụ ya nwe ógbè Agọb,+ nke dị na Beshan:+ obodo ukwu iri isii ndị nwere mgbidi na ihe ntụchi e ji ọla kọpa mee); 14 Ahinadab nwa Ido, onye na-elekọta obodo Mahaneyim;+ 15 Ahimaz, onye na-elekọta obodo Naftalaị+ (ya onwe ya kwa lụụrụ Basemat, ada Sọlọmọn);+ 16 Beana nwa Hushaị, onye na-elekọta Asha+ na Bielọt; 17 Jehọshafat nwa Parua, onye na-elekọta Ịsaka;+ 18 Shimiaị+ nwa Ila, onye na-elekọta obodo Benjamin;+ 19 Giba nwa Yuraị, onye na-elekọta ala Gilied,+ bụ́ ala Saịhọn+ eze ndị Amọraịt,+ bụrụkwa nke Ọg+ eze Beshan,+ e nwekwara otu onye nnọchiteanya bụ́ onyeisi ndị nnọchiteanya ndị ọzọ e nwere n’ala ahụ.
20 Juda na Izrel dị ọtụtụ, baa ụba dị ka ájá dị n’akụkụ oké osimiri,+ ha na-eri ihe, na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ ma na-aṅụrị ọṅụ.+
21 Ma Sọlọmọn chịrị alaeze niile malite n’Osimiri Yufretis+ ruo n’ala ndị Filistia, ruokwa n’ókè Ijipt. Ha na-eweta onyinye ma na-ejere Sọlọmọn ozi n’ụbọchị niile nke ndụ ya.+
22 Nri Sọlọmọn kwa ụbọchị bụ ihe ọ̀tụ̀tụ̀ kọọ+ ntụ ọka* iri atọ e gwere nke ọma na ihe ọ̀tụ̀tụ̀ kọọ ntụ ọka iri isii, 23 ehi iri mara abụba, ehi iri abụọ ndị si n’ebe ịta nri, na otu narị atụrụ, ma e wezụga oké ele+ na nne mgbada+ na mmoro na obu mara abụba. 24 N’ihi na ihe niile dị n’akụkụ nke a nke Osimiri Yufretis+ dị n’okpuru ya, malite na Tifsa ruo Geza,+ ọbụna ndị eze niile nọ n’akụkụ nke a nke Osimiri Yufretis;+ o nwekwara udo+ n’ógbè ya niile, gbaa gburugburu. 25 Juda+ na Izrel wee na-ebi n’obi iru ala,+ onye ọ bụla n’okpuru osisi vaịn ya nakwa n’okpuru osisi fig ya,+ malite na Dan ruo Bia-shiba,+ n’ụbọchị niile nke Sọlọmọn.
26 Sọlọmọn wee nwee puku ụlọ ịnyịnya+ iri anọ maka ụgbọ ịnyịnya+ ya na puku mmadụ iri na abụọ ndị na-agba ịnyịnya.
27 Ndị a bụ́ ndị nnọchiteanya+ na-ebutekwara Eze Sọlọmọn na onye ọ bụla na-abịa na tebụl Eze Sọlọmọn ihe oriri, onye nke ọ bụla n’ọnwa nke ya. Ọ dịghị ihe ha kwere ka ọ kọọ ụkọ. 28 Ha nọkwa na-eweta ọka bali na okporo ọka maka ìgwè ịnyịnya+ n’ebe ọ bụla ọ pụrụ ịbụ, onye ọ bụla dị ka ọrụ ya si dị.+
29 Chineke wee na-enye Sọlọmọn amamihe+ na nghọta+ n’ebe ọ dị ukwuu nakwa obi nwere nghọta dị ukwuu,+ dị ka ájá dị n’ụsọ oké osimiri.+ 30 Amamihe Sọlọmọn dịkwa ukwuu karịa+ amamihe ndị Ọwụwa Anyanwụ niile,+ karịakwa amamihe niile nke Ijipt.+ 31 Ọ makwaara ihe karịa mmadụ ọ bụla ọzọ, karịa Itan+ onye Zira na Himan+ na Kalkọl+ na Dada bụ́ ụmụ Mehọl; o wee na-ede ude ná mba niile gbara ha gburugburu.+ 32 Ọ tụkwara puku ilu atọ,+ abụ ya+ wee dị otu puku na ise. 33 Ọ na-ekwukwa banyere osisi, malite n’osisi sida dị na Lebanọn+ ruo n’osisi hisop+ na-epu n’ahụ́ ájá; ọ na-ekwu banyere anụ ọhịa+ na banyere anụ ufe+ na banyere ihe ndị na-akpụ akpụ+ nakwa banyere azụ̀.+ 34 Ndị si n’ebe dị iche iche nọkwa na-abịa ịnụrụ amamihe Sọlọmọn,+ ọbụna site n’etiti ndị eze niile nke ụwa bụ́ ndị nụrụ banyere amamihe ya.+