Abụ Ọma 22:18 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 18 Ha kere uwe m n’etiti onwe ha,+Ha fekwara nza maka uwe m.+ Luk 23:34 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 34 [Ma Jizọs nọ na-asị: “Nna, gbaghara+ ha, n’ihi na ha amaghị ihe ha na-eme.”]* Ha fekwara nza ka ha wee kesaa uwe ya.+ Jọn 19:23 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 23 Mgbe ndị agha ahụ kpọgidere Jizọs n’osisi, ha chịịrị uwe elu ya, kee ya ụzọ anọ, otu ụzọ maka otu onye agha, chịrịkwa uwe ime ya. Ma uwe ime ahụ enweghị ebe a dụkọtara ya, n’ihi na a kpara ya akpa site n’elu gbadaa.+
34 [Ma Jizọs nọ na-asị: “Nna, gbaghara+ ha, n’ihi na ha amaghị ihe ha na-eme.”]* Ha fekwara nza ka ha wee kesaa uwe ya.+
23 Mgbe ndị agha ahụ kpọgidere Jizọs n’osisi, ha chịịrị uwe elu ya, kee ya ụzọ anọ, otu ụzọ maka otu onye agha, chịrịkwa uwe ime ya. Ma uwe ime ahụ enweghị ebe a dụkọtara ya, n’ihi na a kpara ya akpa site n’elu gbadaa.+