Luk
23 Ìgwè mmadụ ahụ niile wee bilie kpụgara ya Paịlet.+ 2 Ha wee malite ibo ya ebubo,+ sị: “Anyị chọpụtara na nwoke a na-ekpu mba anyị ihu+ ma na-amachibido ịkwụ Siza ụtụ isi,+ na-ekwukwa na ya onwe ya bụ Kraịst, bụ́ eze.”+ 3 Paịlet wee jụọ ya, sị: “Ị̀ bụ eze ndị Juu?” Ọ zara ya, sị: “Ọ bụ gị kwuru ya.”+ 4 Paịlet wee gwa ndị isi nchụàjà na ìgwè mmadụ ahụ, sị: “Ahụghị m ihe ọjọọ ọ bụla nwoke a mere.”+ 5 Ma ha kwusiwere ike, sị: “Ọ na-akpasu ndị mmadụ ime aghara site n’izi ihe n’ime Judia dum, malite na Galili ruo ebe a.” 6 Mgbe Paịlet nụrụ ihe a, ọ jụrụ ma nwoke a ọ̀ bụ onye Galili, 7 mgbe ọ chọpụtara na o si n’ógbè Herọd na-achị, o zigaara ya Herọd,+ bụ́ onye nọkwa na Jeruselem n’ụbọchị ndị a.
8 Mgbe Herọd hụrụ Jizọs, ọ ṅụrịrị ọṅụ nke ukwuu, n’ihi na ọ dịwo anya ọ nọ na-achọ ịhụ+ ya n’ihi na ọ nụwo+ banyere ya, ọ nọkwa na-enwe olileanya ịhụ ihe ịrịba ama ụfọdụ ọ ga-eme. 9 O wee malite ịjụ ya ọtụtụ ajụjụ; ma ọ zaghị ya ihe ọ bụla.+ 10 Otú ọ dị, ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ nọgidere na-ebili ma na-ebosi ya ebubo ike.+ 11 Herọd na ndị agha na-eche ya nche kparịrị ya,+ jirikwa ya mee ihe ọchị+ site n’iyiwe ya uwe mara mma, wee zighachiri ya Paịlet. 12 Herọd na Paịlet+ ghọziri ndị enyi n’ụbọchị ahụ, n’ihi na tupu mgbe ahụ, ha nọ na-ebuso ibe ha iro.
13 Paịlet wee kpọkọta ndị isi nchụàjà na ndị na-achị achị na ìgwè mmadụ ahụ 14 wee sị ha: “Unu kpọtaara m nwoke a dị ka onye na-akpali ndị mmadụ inupụ isi, ma, lee! agbara m ya ajụjụ n’ihu unu ma ahụghị m ihe ọ bụla nwoke a mere+ nke gosiri na ebubo ndị unu na-ebo ya bụ eziokwu. 15 N’eziokwu, Herọd ahụghịkwa, n’ihi na o zighachiteere anyị ya; ma, lee! ọ dịghị ihe kwesịrị ọnwụ+ o mere. 16 Ya mere, m ga-apịa ya ihe+ ma hapụ ya.” 17* —— 18 Ma ha na ìgwè mmadụ ahụ dum tiri mkpu, sị: “Kpọrọ onye a pụọ,+ ma hapụrụ anyị Barabas!”+ 19 (Bụ́ nwoke a tụbara n’ụlọ mkpọrọ n’ihi na ọ kpaliri ndị mmadụ imegide ọchịchị n’obodo ahụ, nakwa n’ihi igbu ọchụ.) 20 Paịlet wee gwa ha okwu ọzọ, n’ihi na ọ chọrọ ịhapụ Jizọs.+ 21 Ha wee malite iti mkpu, na-asị: “Kpọgide ya n’osisi! Kpọgide ya n’osisi!”+ 22 Na nke ugboro atọ ya, ọ sịrị ha: “N’ihi gịnị, olee ihe ọjọọ nwoke a mere? Ahụghị m ihe ọ bụla o mere nke ga-eme ka e gbuo ya; ya mere, m ga-apịa ya ihe ma hapụ ya.”+ 23 Ha wee jiri oké olu malite inye ya nsogbu, na-ekwusi ike ka a kpọgide ya n’osisi; olu ha wee karịa nke ya.+ 24 Ya mere, Paịlet biri ikpe wee kwuo ka e mee ihe ha chọrọ:+ 25 ọ hapụrụ+ nwoke ahụ a tụbara n’ụlọ mkpọrọ n’ihi imegide ọchịchị na igbu ọchụ, bụ́ onye ha chọrọ, ma o nyefere Jizọs ka ha mee ya ihe ha chọrọ.+
26 Ma ka ha kpụ ya na-apụ, ha jidere Saịmọn, bụ́ onye Saịrini, ka o si n’ime obodo na-abịa, ha wee bo ya osisi ịta ahụhụ ka o buru ya soro Jizọs n’azụ.+ 27 Ma ìgwè mmadụ dị ukwuu na ndị inyom, bụ́ ndị na-eti aka n’obi wee na-eruru ya uju ma na-akwara ya ákwá arịrị, na-eso ya n’azụ. 28 Jizọs tụgharịrị n’ebe ndị inyom ahụ nọ wee sị: “Ụmụ nwaanyị Jeruselem, kwụsịnụ ibere m ákwá. Kama nke ahụ, bewerenụ onwe unu na ụmụ unu ákwá;+ 29 n’ihi na, lee! ụbọchị na-abịa mgbe ndị mmadụ ga-asị, ‘Obi ụtọ na-adịrị ụmụ nwaanyị aga, nakwa akpa nwa na-amụghị nwa na ara nwa na-aṅụghị!’+ 30 Mgbe ahụ, ha ga-amalite ịsị ugwu ukwu, ‘Dakwasị anyị!’ sịkwa obere ugwu, ‘Kpuchie anyị!’+ 31 N’ihi na ọ bụrụ na ha na-eme ihe ndị a mgbe osisi dị ndụ, gịnị ga-eme mgbe ọ kpọnwụrụ akpọnwụ?”+
32 Ma e dukwa ndị ikom abụọ ọzọ, bụ́ ndị ajọ omume, na-aga ka e gbuo ha na ya.+ 33 Mgbe ha rukwara n’ebe a na-akpọ Okpokoro Isi,+ n’ebe ahụ ka ha kpọgidere ya na ndị ajọ omume ahụ n’osisi, otu onye n’aka nri ya, otu onye n’aka ekpe ya.+ 34 [Ma Jizọs nọ na-asị: “Nna, gbaghara+ ha, n’ihi na ha amaghị ihe ha na-eme.”]* Ha fekwara nza ka ha wee kesaa uwe ya.+ 35 Ìgwè mmadụ guzo ma na-ekiri ihe na-emenụ.+ Ma ndị na-achị achị nọ na-akwa ya emo, sị: “Ọ zọpụtara ndị ọzọ; ya zọpụta+ onwe ya, ma ọ bụrụ na onye a bụ Kraịst nke Chineke, Onye Ọ Họọrọ.”+ 36 Ọbụna ndị agha ji ya mee ihe ọchị,+ bịaruo ya nso ma nye ya mmanya gbara ụka,+ 37 sị: “Ọ bụrụ na ị bụ eze ndị Juu, zọpụta onwe gị.” 38 E nwekwara ihe e dere n’elu isi ya, sị: “Onye a bụ eze ndị Juu.”+
39 Ma otu n’ime ndị ajọ omume ahụ a kwụwara n’elu osisi malitere ịkparị+ ya, sị: “Ị bụ Kraịst, ka ọ̀ bụ na ị bụghị? Zọpụta onwe gị, zọpụtakwa anyị.” 40 Onye nke ọzọ wee baara ya mba, sị: “Ị́ dịghị atụ egwu Chineke, ugbu a a mara gị otu ikpe ahụ a mara ya?+ 41 Nke anyị zikwara nnọọ ezi, n’ihi na anyị na-anatazu ihe kwesịrị anyị maka ihe ndị anyị mere; ma ọ dịghị ihe na-ekwesịghị ekwesị nwoke a mere.”+ 42 O wee gaa n’ihu ịsị: “Jizọs, cheta m mgbe ị banyere n’alaeze gị.”+ 43 O wee sị ya: “N’ezie, ana m asị gị taa, Mụ na gị ga-anọ+ na Paradaịs.”+
44 Ka ọ dị ugbu a, ọ bụ ihe dị ka oge awa nke isii,* ma ọchịchịrị gbara n’elu ụwa niile ruo n’oge awa nke itoolu,*+ 45 n’ihi na ìhè anyanwụ apụtaghị; ákwà mgbochi+ nke ebe nsọ dọwakwara n’etiti ya ruo n’ala.+ 46 Jizọs wee tie mkpu n’oké olu, sị: “Nna, n’aka gị ka m na-enyefe mmụọ m.”+ Mgbe o kwuru nke a, o kubiri ume.+ 47 Ebe onyeisi ndị agha ahụ hụrụ ihe merenụ, ọ malitere inye Chineke otuto, sị: “N’ezie, nwoke a bụ onye ezi omume.”+ 48 Mgbe ìgwè mmadụ ahụ dum, bụ́ ndị zukọtara n’ebe ahụ n’ihi ihe ijuanya a, hụrụ ihe niile merenụ, ha tiiri aka n’obi na-ala. 49 Ndị niile ya na ha maara guzokwa n’ebe dịtụ anya.+ Ndị inyom, bụ́ ndị dum si na Galili soro ya, guzo na-ahụ ihe ndị a.+
50 Ma, lee! otu nwoke aha ya bụ Josef, onye bụ́ onye òtù Nzukọ,* ọ bụkwa ezi mmadụ na nwoke ezi omume+— 51 nwoke a akwadoghị atụmatụ ha na ihe ha mere+—ọ bụ onye Arimatia, bụ́ obodo ndị Judia, ọ na-echerekwa alaeze Chineke;+ 52 nwoke a gakwuuru Paịlet ma rịọ ka e bunye ya ozu Jizọs.+ 53 O wee budata+ ya ma fụchie ya ákwà linin ọma, o wee lie ya n’ili+ e gwuru n’oké nkume, nke ọ na-adịbeghị onye e liri na ya.+ 54 Ma ọ bụ ụbọchị Nkwadebe,+ ụbọchị izu ike+ na-erukwa nso ná mgbede. 55 Ma ndị inyom ahụ, ndị ya na ha so pụta na Galili, so gaa kirie ili ncheta+ ahụ na otú e si lie ozu ya;+ 56 ha wee laghachi ịga kwadebe ihe na-esi ísì ụtọ na mmanụ na-esi ísì ụtọ.+ Ma, otú ọ dị, ha zuru ike+ n’ụbọchị izu ike dị ka e nyere n’iwu.