Matiu 12:15 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 15 Ebe Jizọs matara nke a, o si ebe ahụ pụọ. Ọtụtụ ndị sokwaara ya, o wee gwọọ ha niile,+ Matiu 14:14 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 14 Mgbe ọ pụtara, ọ hụrụ oké ìgwè mmadụ; o wee nwee ọmịiko+ n’ebe ha nọ, o wee gwọọ ndị ha na-arịa ọrịa.+ Matiu 15:30 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 30 Oké ìgwè mmadụ wee kpọrọ ndị dara ngwọrọ, ndị nwere nkwarụ, ndị ìsì, ndị ogbi, na ọtụtụ ndị na-arịa ihe ndị ọzọ, bịakwute ya. Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ha na-atọgbọ ha n’ụkwụ ya, o wee gwọọ ha;+ Luk 5:15 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 15 Ma okwu banyere ya nọ na-agbasakwu, oké ìgwè mmadụ na-agbakọtakwa ka ha gee ya ntị, ka ọ gwọọkwa ha ọrịa na-arịa ha.+
14 Mgbe ọ pụtara, ọ hụrụ oké ìgwè mmadụ; o wee nwee ọmịiko+ n’ebe ha nọ, o wee gwọọ ndị ha na-arịa ọrịa.+
30 Oké ìgwè mmadụ wee kpọrọ ndị dara ngwọrọ, ndị nwere nkwarụ, ndị ìsì, ndị ogbi, na ọtụtụ ndị na-arịa ihe ndị ọzọ, bịakwute ya. Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ha na-atọgbọ ha n’ụkwụ ya, o wee gwọọ ha;+
15 Ma okwu banyere ya nọ na-agbasakwu, oké ìgwè mmadụ na-agbakọtakwa ka ha gee ya ntị, ka ọ gwọọkwa ha ọrịa na-arịa ha.+