32 Dị ka ihe atụ, onye ọ bụla nke kwuru okwu megide Nwa nke mmadụ, a ga-agbaghara ya onye ahụ;+ ma onye ọ bụla nke kwuru okwu megide mmụọ nsọ, a gaghị agbaghara ya onye ahụ, ee e, ọ bụghị n’usoro ihe nke a ma ọ bụkwanụ na nke na-abịa abịa.+
4 N’ihi na a pụghị ime ka ndị e mere ka ha nwee nghọta naanị otu ugboro+ chegharịa ọzọ, bụ́ ndị detụkwara onyinye eluigwe e nyere n’efu ire,+ ndị ghọwokwara ndị so keta mmụọ nsọ,+
6 ma ghọọ ndị dapụrụ adapụ,+ ee, a pụghị ime ka ha chegharịa ọzọ,+ n’ihi na ha na-akpọgide Ọkpara Chineke ọzọ n’osisi ma na-eme ka ihere mee ya n’ihu ọha.+
26 N’ihi na ọ bụrụ na anyị elezie anya+ na-eme mmehie mgbe anyị nwetasịrị ezi ihe ọmụma nke eziokwu ahụ,+ ọ dịkwaghị àjà ọ bụla fọrọ a ga-achụ maka mmehie,+
16 Ọ bụrụ na onye ọ bụla ahụ nwanna ya ka ọ na-eme mmehie nke na-adịghị eweta ọnwụ,+ ọ ga-arịọrọ ya arịrịọ, Chineke ga-enyekwa ya ndụ,+ ya bụ, ndị na-adịghị eme emehie ga-ewetara ha ọnwụ.+ Ọ dị mmehie nke na-eweta ọnwụ. Ọ bụghị banyere mmehie ahụ ka m na-agwa ya ka ọ rịọ arịrịọ.+