23 Ma nke ahụ a ghara n’ala dị mma bụ onye na-anụ okwu ahụ ma na-aghọta ihe ọ pụtara, bụ́ onye na-amị mkpụrụ ma na-emepụta ihe, nke a okpukpu otu narị, nke ahụ iri isii, nke ọzọ iri atọ.”+
4 Ya mere, ụmụnna m, e mekwara ka unu nwụọ n’ebe Iwu+ ahụ dị site n’ahụ́ Kraịst, ka unu wee ghọọ ndị onye ọzọ nwe,+ ndị onye ahụ e si ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite nwe,+ ka anyị wee mịara Chineke mkpụrụ.+
10 ka unu wee na-eje ije n’ụzọ kwesịrị+ Jehova+ iji na-eme ihe na-amasị ya n’ụzọ zuru ezu, ka unu na-amị mkpụrụ n’ezi ọrụ+ ọ bụla ma na-enwekwu ezi ihe ọmụma+ nke Chineke,
8 N’ihi na ọ bụrụ na ihe ndị a adịrị n’ime unu ma jubiga ókè, ha ga-eme ka unu ghara ịbụ ndị na-adịghị arụ ọrụ ma ọ bụ ndị na-adịghị amị mkpụrụ+ n’ihe metụtara ezi ihe ọmụma banyere Onyenwe anyị Jizọs Kraịst.