Ndị Kọlọsi
1 Pọl, onyeozi nke Kraịst Jizọs site n’uche Chineke,+ na Timoti+ nwanna anyị, 2 na-edetara unu akwụkwọ, unu ndị nsọ na ụmụnna kwesịrị ntụkwasị obi, ndị ha na Kraịst dị n’otu,+ bụ́ ndị nọ na Kọlọsi:
Ka obiọma na-erughịrị mmadụ na udo nke si n’aka Chineke bụ́ Nna anyị dịrị unu.+
3 Anyị na-ekele+ Chineke bụ́ Nna nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst oge niile mgbe anyị na-ekpe ekpere maka unu,+ 4 ebe anyị nụrụ banyere okwukwe unu nwere n’ime Kraịst Jizọs na ịhụnanya unu nwere maka ndị nsọ niile+ 5 n’ihi olileanya+ ahụ unu nwere, nke e debeere unu n’eluigwe.+ Unu nụrụ banyere olileanya a na mbụ site ná nkwusa e kwusara eziokwu nke ozi ọma ahụ+ 6 nke rutere n’ebe unu nọ, ọbụna dị ka ọ na-amị mkpụrụ+ ma na-amụba+ n’ụwa niile,+ dị nnọọ ka ọ na-emekwa n’etiti unu, malite n’ụbọchị unu nụrụ banyere obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ,+ matakwa ya n’ụzọ ziri ezi nakwa n’eziokwu.+ 7 Nke ahụ bụ ihe unu nụrụ n’ọnụ Epafras+ bụ́ ohu ibe anyị nke anyị hụrụ n’anya, bụ́ onye ozi Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi nke na-anọchite anya anyị, 8 onye mekwara ka anyị mara ịhụnanya unu+ nwere site n’enyemaka nke mmụọ nsọ.
9 Ọ bụ ya mere na anyị akwụsịbeghị ikpe ekpere maka unu+ malite n’ụbọchị anyị nụrụ ya nakwa ịrịọ arịrịọ ka unu jupụta n’ezi ihe ọmụma+ nke uche ya n’amamihe+ niile na nghọta ime mmụọ,+ 10 ka unu wee na-eje ije n’ụzọ kwesịrị+ Jehova+ iji na-eme ihe na-amasị ya n’ụzọ zuru ezu, ka unu na-amị mkpụrụ n’ezi ọrụ+ ọ bụla ma na-enwekwu ezi ihe ọmụma+ nke Chineke, 11 ebe ọ bụ na e ji ike niile na-eme ka unu dị ike dị ka ike ya dị ebube si dị,+ ka unu wee tachie obi+ n’ụzọ zuru ezu, jirikwa ọṅụ na-enwe ogologo ntachi obi, 12 na-ekele Nna anyị, onye mere ka unu ruo eru iketa òkè n’ihe nketa+ nke ndị nsọ,+ bụ́ ndị nọ n’ìhè ahụ.+
13 Ọ napụtara anyị n’ikike+ nke ọchịchịrị ma wega+ anyị n’alaeze+ nke Ọkpara nke ịhụnanya ya,+ 14 onye e si n’aka ya jiri ihe mgbapụta tọhapụ anyị, ya bụ, mgbaghara nke mmehie anyị.+ 15 Ọ bụ onyinyo+ nke Chineke a na-apụghị ịhụ anya,+ onye e bu ụzọ mụọ+ n’ime ihe niile e kere eke; 16 n’ihi na e si n’aka+ ya kee ihe ndị ọzọ niile n’eluigwe na n’elu ụwa, ihe ndị a pụrụ ịhụ anya na ihe ndị a na-apụghị ịhụ anya, n’agbanyeghị ma ọ̀ bụ ocheeze ma ọ bụ ịbụisi ma ọ bụ ọchịchị ma ọ bụ ikike.+ E kere ihe ndị ọzọ niile site n’aka+ ya nakwa maka ya. 17 Ọ dịkwa tupu ihe ndị ọzọ niile,+ e mekwara ka ihe ndị ọzọ niile dịrị site n’aka ya,+ 18 ọ bụkwa isi nke ahụ́ ahụ, ya bụ, ọgbakọ ya.+ Ọ bụ mmalite, onye e bu ụzọ mụọ, bụ́ onye mbụ si ná ndị nwụrụ anwụ bilie,+ ka o wee bụrụ onye bu ụzọ+ n’ihe niile; 19 n’ihi na Chineke hụrụ na ọ dị mma ka ihe niile biri n’ime ya n’ụzọ zuru ezu,+ 20 na isi n’aka ya mee ka ya na ihe ndị ọzọ+ niile dị ná mma+ site n’iji ọbara+ ahụ ọ wụsịrị n’osisi ịta ahụhụ+ mee udo,+ n’agbanyeghị ma ọ̀ bụ ihe ndị dị n’elu ụwa ma ọ bụ ihe ndị dị n’eluigwe.
21 N’ezie, unu ndị e kewapụrụ ekewapụ n’oge gara aga,+ ndị bụkwa ndị iro n’ihi na uche unu dị n’ọrụ ọjọọ,+ 22 ọ bụ unu ka o mere ugbu a ka unu na ya dị ná mma+ site n’anụ ahụ́ nke onye ahụ, site n’ọnwụ ya,+ ka o wee chee unu n’ihu ya dị ka ndị dị nsọ na ndị na-enweghị mmerụ+ na ndị a na-adịghị ebo ebubo+ n’ihu ya, 23 ma ọ bụrụhaala na unu anọgide n’okwukwe,+ bụrụ ndị e mere ka ha kwụsie ike na ntọala ahụ,+ bụrụkwa ndị guzosiri ike,+ ka a ghara ime ka unu si n’olileanya nke ozi ọma ahụ unu nụrụ pụọ,+ nke e kwusara+ n’etiti ihe niile e kere eke+ dị n’okpuru eluigwe. Ọ bụ ozi ọma nke a ka mụ onwe m bụ́ Pọl ghọrọ onye ozi ya.+
24 Ana m aṅụrị ọṅụ ugbu a n’ahụhụ m na-ata n’ihi unu.+ Mụ onwe m na-enweta n’anụ ahụ́ m ihe fọdụrụ ná mkpagbu+ m ga-enwe n’ihi Kraịst maka ọdịmma nke ahụ́ ya, nke bụ́ ọgbakọ ya.+ 25 Aghọrọ m onye ozi+ nke ọgbakọ a dị ka ọrụ nlekọta ụlọ+ nke Chineke nyere m si dị, bụ́ nke o nyere m maka ọdịmma unu iji kwusaa okwu Chineke n’ụzọ zuru ezu, 26 bụ́ ihe nzuzo ahụ dị nsọ+ nke e zoro ezo kemgbe usoro ihe ndị gara aga,+ kemgbe ọgbọ ndị gara aga. Ma ugbu a, e mewo ka ọ pụta ìhè+ n’ebe ndị nsọ ya nọ, 27 bụ́ ndị ọ masịrị Chineke ime ka ha mara ihe bụ́ akụ̀ dị ebube+ nke ihe nzuzo a dị nsọ+ n’etiti ndị mba ọzọ. Ọ bụ ịdị n’otu unu na Kraịst,+ ya bụ, olileanya unu nwere ikere òkè n’ebube ya.+ 28 Ọ bụ onye ahụ ka anyị na-ekwusa,+ na-adụ mmadụ niile ọdụ, jirikwa amamihe+ niile na-ezi mmadụ niile ihe, ka anyị wee chee mmadụ niile, bụ́ ndị ha na Kraịst dị n’otu, n’ihu Chineke dị ka ndị tozuru okè.+ 29 Ọ bụ nke a mere m ji na-arụsi ọrụ ike, na-adọgbu onwe m n’ọrụ+ site n’ike ya,+ bú nke na-arụ ọrụ n’ime m.+