31 Mgbe ahụ, Jizọs sịrị ha: “Unu niile ga-asụ ngọngọ n’ihi m n’abalị a, n’ihi na e dere, sị, ‘M ga-egbu onye ọzụzụ atụrụ, ìgwè atụrụ ya ga-agbasasịkwa.’+
32 Lee! Oge awa na-abịa, n’ezie, ọ bịawo, mgbe a ga-achụsasị unu, onye ọ bụla alaa n’ụlọ ya,+ unu ga-ahapụkwa naanị m; ma anọghị m naanị m, n’ihi na Nna m nọnyeere m.+