Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Abụ Ọma 22:okwu mmeghe-31
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • Ntụziaka e nyere onye nduzi nke Nne Ele Isi Ụtụtụ. Abụ olu ụtọ Devid.

      22 Chineke m, Chineke m, gịnị mere i ji hapụ m?+

      Gịnị mere i ji nọrọ n’ebe dị anya ghara ịbịa zọpụta m,+

      Wee ghara ige ntị ná mkpu arịrị m na-eti?+

       2 Chineke m, m na-akpọku gị n’ehihie, ma ị dịghị aza;+

      M na-akpọkukwa gị n’abalị, adịghị m emechi ọnụ.+

       3 Ma gị onwe gị dị nsọ,+

      Onye bi n’etiti otuto Izrel.+

       4 Ọ bụ gị ka nna anyị hà tụkwasịrị obi;+

      Ha tụkwasịrị gị obi, i wee na-emere ha ụzọ mgbapụ.+

       5 Ọ bụ gị ka ha tikuru,+ ha wee lanahụ;+

      Gị ka ha tụkwasịrị obi, ihere emeghịkwa ha.+

       6 Ma abụ m idide,+ abụghị m mmadụ,

      Onye ndị mmadụ na-akọcha nakwa onye ndị mmadụ na-eleda anya.+

       7 Ndị niile na-ahụ m na-akwa m emo;+

      Ha na-emeghe ọnụ ha iji kwaa m emo, ha na-efufekwa isi, na-asị:+

       8 “O nyefere onwe ya n’aka Jehova.+ Ya meere ya ụzọ mgbapụ!+

      Ya napụta ya, ebe ọ bụ na ihe ya masịrị ya!”+

       9 N’ihi na ọ bụ gị bụ Onye si n’afọ sepụta m,+

      Onye mere ka obi ruo m ala mgbe m na-aṅụ ara nne m.+

      10 E nyefere m n’aka gị malite n’oge m nọ n’akpa nwa;+

      Ị bụ Chineke m malite n’oge m nọ n’afọ nne m.+

      11 Anọla m n’ebe dị anya, n’ihi na nsogbu dị nso,+

      N’ihi na enweghị m onye inyeaka ọzọ.+

      12 Ọtụtụ ụmụ oké ehi agbaala m gburugburu;+

      Oké ehi ndị dị ike nke Beshan agbawo m gburugburu.+

      13 Ha emeghewo ọnụ ha imegide m,+

      Dị ka ọdụm nke nọ na-adọri anụ ma na-ebigbọ.+

      14 A wụpụwo m dị ka mmiri,+

      Ọkpụkpụ m niile ekwokapụsịwo.+

      Obi m dịzi ka mgbá aṅụ;+

      Ọ gbazewo n’ime ime afọ m.+

      15 Ike adịkwaghị m, adịzi m ka ibe eju,+

      E mewokwa ka ire m rapara n’ágbụ̀ m;+

      Ọ bụkwa n’ájá ọnwụ ka ị na-eme ka m nọrọ.+

      16 N’ihi na nkịta agbawo m gburugburu;+

      Nzukọ ndị na-eme ihe ọjọọ agbawo m okirikiri.+

      Ha na-ata m arụ n’aka nakwa n’ụkwụ dị ka ọdụm.+

      17 M nwere ike ịgụ ọkpụkpụ m niile ọnụ.+

      Ha onwe ha na-ele anya, ha na-ele m anya.+

      18 Ha kere uwe m n’etiti onwe ha,+

      Ha fekwara nza maka uwe m.+

      19 Ma gị onwe gị, Jehova, biko, anọla n’ebe dị anya.+

      Gị onye bụ́ ike m,+ bịa ngwa ngwa nyere m aka.+

      20 Biko, napụta mkpụrụ obi m ná mma agha,+

      Napụta otu ihe a m nwere n’aka nkịta;+

      21 Biko, zọpụta m n’ọnụ ọdụm,+

      Za m ma zọpụta m na mpi atụ́.+

      22 M ga-akọsara ụmụnna m+ aha gị;+

      M ga-anọ n’ime ọgbakọ too gị.+

      23 Unu ndị na-atụ egwu Jehova, toonụ ya!+

      Unu niile bụ́ mkpụrụ Jekọb, nyenụ ya otuto!+

      Ka egwu ya jidekwa unu, unu niile bụ́ mkpụrụ Izrel.+

      24 N’ihi na ọ dịghị eleda mmekpa ahụ́ nke onye nọ n’ahụhụ anya,+

      Ọ dịghịkwa eleghara ya anya;+

      O wepụghịkwa ihu ya n’ebe ọ nọ,+

      Mgbe o tikuru ya maka enyemaka, ọ nụrụ.+

      25 M ga-anọ n’ime ọgbakọ dị ukwuu too gị n’ihi ihe i mere;+

      M ga-emezu nkwa m n’ihu ndị na-atụ egwu ya.+

      26 Ndị dị umeala n’obi ga-eri ihe rijuo afọ;+

      Ndị na-achọ Jehova ga-eto ya.+

      Ka obi unu dị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.+

      27 Nsọtụ niile nke ụwa ga-echeta Jehova ma chigharịkwuru ya.+

      Ezinụlọ niile nke mba dị iche iche ga-akpọkwa isiala n’ihu gị.+

      28 N’ihi na ọ bụ Jehova nwe ọbụbụeze,+

      Ọ bụkwa ya na-achị mba niile.+

      29 Ndị ọgaranya niile nọ n’ụwa ga-eri ihe kpọọ isiala;+

      Ndị niile na-agbada n’ájá ga-ehulata ala n’ihu ya,+

      Ọ dịghịkwa onye ga-eme ka mkpụrụ obi nke ya na-adị ndụ.+

      30 Ụmụ a ka ga-amụ ga-ejere ya ozi;+

      A ga-akọrọ ọgbọ ọzọ banyere Jehova.+

      31 Ha ga-abịa kọọrọ ndị a ka ga-amụ amụ+

      Banyere ezi omume ya, ha ga-akọrọ ha na ọ bụ ya mere ihe a.+

  • Aịzaya 53:1-12
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 53 Ònye nwere okwukwe n’ihe anyị nụrụ?+ Ònyekwa ka e kpugheere+ ogwe aka Jehova?+ 2 Ọ ga-epulite dị ka ome+ n’ihu ya, ọ ga-adịkwa ka mgbọrọgwụ nke dị n’ala mmiri na-adịghị. Ọ dịghị ka onye ukwu, ọ dịghịkwa ebube;+ mgbe anyị ga-ahụ ya, ọ gaghị adị otú ga-eme ka anyị chọsie ya ike.+

      3 Ndị mmadụ ledara ya anya, zerekwa ya,+ ọ bụ onye nwere ihe mgbu, onye makwaara ihe bụ́ ọrịa.+ Ọ bụkwa onye anyị wepụrụ ihu anyị n’ebe ọ nọ.+ E ledara ya anya, ọ dịghịkwa ihe anyị ji ya kpọrọ.+ 4 N’eziokwu, ọ bụ ọrịa anyị ka ya onwe ya buuru;+ o bukwaara ihe mgbu anyị.+ Ma anyị gụrụ ya n’onye e tiri ihe otiti,+ onye Chineke tiri ihe,+ mekpaakwa ahụ́.+ 5 Ma a mara ya ube+ n’ihi mmebi iwu anyị;+ a nọkwa na-echi ya ọnụ n’ala n’ihi njehie anyị.+ A pịara ya ụtarị nke ga-eme ka anyị nwee udo,+ a gwọrọ anyị+ n’ihi ọnyá ya.+ 6 Anyị niile awagharịwo dị ka atụrụ;+ onye ọ bụla n’ime anyị gawara n’ụzọ nke ya; Jehova emewokwa ka onye ahụ buru njehie anyị niile.+ 7 Ihe isi ike dakwasịrị ya,+ o kwekwara ka e mekpaa ya ahụ́;+ ma o mepeghị ọnụ ya. A kpụụrụ ya dị ka atụrụ a gaje igbu egbu;+ dịkwa ka nne atụrụ nke dara ogbi n’ihu ndị na-akpacha ya ajị, otú ahụkwa ka ọ na-emepeghị ọnụ ya.+

      8 A kpụụrụ ya pụọ n’ihi na e gbochiri ikpe ziri ezi,+ kpeekwa ya ikpe mkpegbu; ònyekwa ga-echegbu onwe ya banyere ihe niile mere n’ọgbọ ya?+ N’ihi na e bipụrụ ya+ n’ala ndị dị ndụ.+ E tiri ya ihe+ n’ihi mmebi iwu nke ndị m.+ 9 Mgbe ọ nwụrụ, ili ya ga-adị n’etiti ndị ajọ omume+ nakwa n’etiti ndị ọgaranya,+ n’agbanyeghị na o meghị ihe ike ọ bụla,+ aghụghọ adịghịkwa ya n’ọnụ.+

      10 Ma ọ tọrọ Jehova ụtọ igwepịa ya.+ O mere ka ọ rịa ọrịa.+ Ọ bụrụ na ị ga-eme ka mkpụrụ obi ya bụrụ àjà ikpe ọmụma,+ ọ ga-ahụ ụmụ ya,+ ọ ga-emekwa ka ụbọchị ya dị ogologo.+ Ihe na-atọ Jehova ụtọ+ ga-aga nke ọma+ n’aka ya. 11 N’ihi nsogbu nke mkpụrụ obi ya, ihe ọ ga-ahụ+ ga-eju ya afọ.+ Site n’ihe onye ezi omume ahụ, bụ́ ohu m,+ maara, ọ ga-eme ka ọtụtụ ndị ghọọ ndị ezi omume;+ ọ ga-eburukwa njehie ha.+ 12 N’ihi nke ahụ, m ga-ekenye ya òkè n’etiti ọtụtụ ndị,+ ọ bụkwa ya na ndị dike ga-eke ihe a kwatara n’agha,+ n’ihi na ọ wụpụụrụ ọnwụ mkpụrụ obi ya,+ a gụnyekwara ya ná ndị na-emebi iwu;+ ya onwe ya buuru mmehie ọtụtụ ndị,+ ọ gbachiteere ndị na-emebi iwu.+

  • Abụ Ákwá 4:20
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 20 E jidewo ume anyị na-eku,+ bụ́ onye Jehova tere mmanụ,+ ná nnukwu olulu ha,+

      Onye anyị kwuru banyere ya, sị: “Na ndò ya+ ka anyị ga-ebi n’etiti mba dị iche iche.”+

  • Daniel 9:26
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 26 “Mgbe izu iri isii na abụọ ahụ gasịrị, a ga-ebipụ Mesaya,+ ya agbara aka.+

      “Ndị nke onye ndú ahụ na-abịanụ ga-ebibi+ obodo ahụ na ebe nsọ ahụ.+ Ọ bụkwa idei mmiri ka a ga-eji bibie ya. A ga na-alụ agha ruo ná ngwụsị; ihe e kpebiri bụ mbibi.+

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya