64 Jizọs sịrị+ ya: “Ọ bụ gị kwuru ya.+ Ma ana m asị unu, Site ugbu a+ gaa n’ihu, unu ga-ahụ Nwa nke mmadụ+ ka ọ nọ ọdụ n’aka nri+ nke ike ma na-abịa n’ígwé ojii nke eluigwe.”+
14 M wee hụ, ma, lee! igwe ojii na-acha ọcha, na otu onye nke yiri nwa nke mmadụ+ nke nọ n’elu ígwé ojii ahụ, o kpukwa okpueze ọlaedo+ n’isi ya, mma owuwe ihe ubi nke dị nkọ dịkwa n’aka ya.