61Mmụọ nke Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova dị n’ahụ́ m,+ n’ihi na Jehova etewo m mmanụ+ izi ndị dị umeala n’obi ozi ọma.+ O zitewo m ikechi ọnyá nke ndị e tiwara obi,+ ịkpọsara ndị a dọọrọ n’agha+ na a tọhapụwo ha, na imeghe anya ndị mkpọrọ;+
15 Okwu a+ kwesịrị ntụkwasị obi, kwesịkwa ka a nabata ya n’ụzọ zuru ezu, ya bụ, na Kraịst Jizọs bịara n’ụwa ịzọpụta ndị mmehie.+ N’ime ndị a, abụ m onye mbụ.+