3 N’ihi na m ga-enye onye akpịrị na-akpọ nkụ mmiri+ ka ọ ṅụọ, meekwa ka iyi nke na-asọ nwayọọ nwayọọ dịrị n’ebe kpọrọ nkụ.+ M ga-awụkwasị mkpụrụ gị mmụọ m,+ wụkwasịkwa ụmụ gị ngọzi m.
28 “Ọ ga-erukwa na mgbe e mesịrị, m ga-awụkwasị mmụọ+ m n’ahụ́ ụdị anụ ahụ́ ọ bụla,+ ụmụ unu ndị ikom na ụmụ unu ndị inyom+ ga-ebukwa amụma. Ndị agadi unu ga-arọ nrọ. Ụmụ okorobịa unu ga-ahụkwa ọhụụ.
16 Jọn zara ha niile, sị: “Mụ onwe m ji mmiri na-eme unu baptizim; ma onye ka m ike na-abịa, bụ́ onye m na-erughị eru ịtọpụ eriri akpụkpọ ụkwụ ya.+ Ọ ga-eji mmụọ nsọ na ọkụ mee unu baptizim.+
13 N’ihi na n’ezie e mere anyị niile baptizim+ site n’otu mmụọ nsọ ịbụ otu ahụ́, ma ànyị bụ ndị Juu ma ànyị bụ ndị Grik, ma ànyị bụ ndị ohu ma ànyị bụ ndị nweere onwe ha, e mekwara ka anyị niile ṅụọ+ otu mmụọ nsọ.