28 Jizọs sịrị ha: “N’ezie, ana m asị unu, Mgbe a ga-eme ka ihe dị ọhụrụ, mgbe Nwa nke mmadụ ga-anọdụ ala n’ocheeze ya dị ebube, unu onwe unu ndị sowooro m ga-anọdụkwa ala n’ocheeze iri na abụọ, na-ekpe ebo iri na abụọ nke Izrel ikpe.+
2 Ka ọ̀ bụ na unu amaghị na ndị nsọ ga-ekpe+ ụwa+ ikpe? Ọ bụrụkwa na ọ bụ unu ga-ekpe ụwa ikpe, ọ̀ bụ na unu erughị eru ikpe ihe na-enweghị ihe ha bụ+ ikpe?
6 Onye obi ụtọ+ na onye dị nsọ+ ka onye ọ bụla nke nwere òkè ná mbilite n’ọnwụ mbụ bụ; ọnwụ nke abụọ+ enweghị ikike+ n’ebe ndị a nọ, kama ha ga-abụ ndị nchụàjà+ nke Chineke na nke Kraịst, ha ga-esokwa ya chịa dị ka ndị eze ruo otu puku afọ ahụ.+