11 Mụ onwe m ji mmiri na-eme unu baptizim+ n’ihi nchegharị unu;+ ma onye ahụ nke na-abịa+ n’azụ m ka m ike, onye m na-erughị eru iyipụ akpụkpọ ụkwụ ya.+ Onye ahụ ga-eji mmụọ nsọ+ na ọkụ+ mee unu baptizim.
25 Ma mgbe ozi Jọn na-agwụcha, ọ sịrị, ‘Gịnị ka unu chere na m bụ? Ọ bụghị m bụ ya. Kama, lee! e nwere onye na-abịa n’azụ m nke m na-erughị eru ịtọpụ akpụkpọ ụkwụ ya.’+