10 A gaghị ahụ n’etiti unu onye ọ bụla nke na-esure* nwa ya nwoke ma ọ bụ nwa ya nwaanyị n’ọkụ,+ onye ọ bụla nke na-agba afa,+ onye na-eme anwansi+ ma ọ bụ onye ọ bụla nke na-achọ ihe mgbaàmà ọdịnihu+ ma ọ bụ dibịa anwansi,+
2 Eze wee kwuo ka a kpọọ ndị dibịa anwansi+ na ndị na-akpọku ndị mmụọ ọjọọ na ndị dibịa afa na ndị Kaldia ka ha bịa kọọrọ eze nrọ ọ rọrọ.+ Ha wee bata guzo n’ihu eze.
9 Ma n’obodo ahụ, e nwere otu nwoke aha ya bụ Saịmọn, bụ́ onye nọ na-eme anwansi+ tupu oge a, na-emekwa ihe na-eju obodo Sameria anya, na-ekwu na ya onwe ya bụ nnukwu mmadụ.+