3 Otú ọ dị, Sọl malitere imeso ọgbakọ ahụ n’ụzọ jọgburu onwe ya. Ọ na-awakwasị ụlọ niile n’otu n’otu, na-adọkpụpụta ma ndị ikom ma ndị inyom, ọ na-enyefekwa ha ka a tụba ha n’ụlọ mkpọrọ.+
2 ma gwa ya ka o nye ya akwụkwọ ozi ndị ọ ga-eji gaa n’ụlọ nzukọ ndị dị na Damaskọs, ka o wee kee onye ọ bụla nke so n’Ụzọ Ahụ+ agbụ ma kpụrụ ya bịa Jeruselem, ma ndị ikom ma ndị inyom.
13 ọ bụ ezie na n’oge gara aga, abụ m onye nkwulu na onye mkpagbu+ na onye na-akparị mmadụ.+ Otú ọ dị, e meere m ebere,+ n’ihi na amaghị m ihe mgbe ahụ,+ emekwara m ya n’ihi enweghị okwukwe.