Ọrụ Ndịozi
9 Ma Sọl, onye ka na-eyi ndị na-eso ụzọ+ Onyenwe anyị egwu, na-achọsikwa ike igbu ha,+ gakwuuru nnukwu onye nchụàjà 2 ma gwa ya ka o nye ya akwụkwọ ozi ndị ọ ga-eji gaa n’ụlọ nzukọ ndị dị na Damaskọs, ka o wee kee onye ọ bụla nke so n’Ụzọ Ahụ+ agbụ ma kpụrụ ya bịa Jeruselem, ma ndị ikom ma ndị inyom.
3 Ka ọ nọ na-eme njem, ọ bịaruru Damaskọs nso. Mgbe ahụ, ìhè si n’eluigwe nwuo gburugburu ya na mberede,+ 4 o wee daa n’ala ma nụ olu nke na-agwa ya, sị: “Sọl, Sọl, gịnị mere i ji na-akpagbu m?”+ 5 O wee sị: “Ị̀ bụ onye, Onyenwe anyị?” Ọ sịrị ya: “Abụ m Jizọs, onye ị na-akpagbu.+ 6 Otú o sina dị, bilie+ banye n’ime obodo, a ga-agwakwa gị ihe ị ga-eme.” 7 Ma ndị ikom ya na ha na-eme njem+ guzo n’ekwughị okwu.+ N’ezie, ha na-anụ olu okwu,+ ma ọ dịghị onye ha na-ahụ. 8 Ma Sọl si n’ala bilie, ọ dịghịkwa ihe ọ na-ahụ n’agbanyeghị na anya ya meghere emeghe.+ Ya mere, ha sekpụụrụ ya n’aka ma duru ya banye Damaskọs. 9 Ruo ụbọchị atọ, ọ hụghị ihe ọ bụla,+ o righị ihe, ọ ṅụghịkwa ihe ọṅụṅụ.
10 Na Damaskọs, e nwere otu onye na-eso ụzọ Jizọs aha ya bụ Ananayas,+ Onyenwe anyị gwara ya n’ọhụụ, sị: “Ananayas!” O wee sị: “Lee m, Onyenwe anyị.” 11 Onyenwe anyị wee sị ya: “Bilie, gaa n’okporo ámá a na-akpọ Nke Kwụ Ọtọ, chọọkwa, n’ụlọ Judas, otu nwoke aha ya bụ Sọl, onye Tasọs.+ N’ihi na, lee! ọ na-ekpe ekpere. 12 N’ọhụụ, ọ hụrụ ka otu nwoke aha ya bụ Ananayas batara ma bikwasị ya aka n’isi ka o wee maliteghachi ịhụ ụzọ.”+ 13 Ma Ananayas zara, sị: “Onyenwe anyị, anụwo m n’ọnụ ọtụtụ ndị banyere nwoke a, nụkwa ọtụtụ ihe ọjọọ o mere ndị nsọ gị na Jeruselem. 14 O nwekwara ikike ndị isi nchụàjà nyere ya ike ndị niile na-akpọku aha gị agbụ.”+ 15 Ma Onyenwe anyị gwara ya, sị: “Gawa, n’ihi na nwoke a bụ arịa m họọrọ+ ka o buru aha m gakwuru ndị mba ọzọ,+ gakwurukwa ndị eze+ na ụmụ Izrel. 16 N’ihi na m ga-egosi ya nke ọma ọtụtụ ahụhụ ọ na-aghaghị ịta n’ihi aha m.”+
17 Ya mere, Ananayas pụrụ ma banye n’ụlọ ahụ, o bikwasịkwara ya aka n’isi wee sị: “Sọl, nwanna m, Onyenwe anyị, bụ́ Jizọs ahụ nke pụtara ìhè n’ihu gị n’ụzọ i si bịa, ezitewo m, ka i wee hụwa ụzọ ma jupụta na mmụọ nsọ.”+ 18 Ihe yiri akpịrịkpa si n’anya ya dapụtasịa ozugbo, o wee hụwa ụzọ; o bilikwara, e wee mee ya baptizim, 19 o wee rie nri ma nweta ume.+
Ya na ndị ahụ na-eso ụzọ Jizọs nọ na Damaskọs nọrọ ruo ụbọchị ụfọdụ,+ 20 ozugbo ahụ, n’ụlọ nzukọ, ọ malitere ikwusa Jizọs,+ na ọ bụ Onye a bụ Ọkpara Chineke. 21 Ma o juru ndị niile na-anụ ihe ọ na-ekwu anya, ha na-ekwukwa, sị: “Onye a ọ́ bụghị nwoke ahụ nke kpagburu+ ndị na-akpọku aha a na Jeruselem, onye bịakwara ebe a n’ihi nzube nke a, ka o kee ha agbụ ma kpụrụ ha gakwuru ndị isi nchụàjà?”+ 22 Ma Sọl nọ na-enwetakwu ike, ma na-etinye ndị Juu bi na Damaskọs ná mgbagwoju anya ka ọ na-egosi n’ụzọ ezi uche dị na ya na onye a bụ Kraịst.+
23 Ma mgbe ọtụtụ ụbọchị gafere, ndị Juu gbara izu igbu ya.+ 24 Otú ọ dị, Sọl matara banyere nkata ha kpaara ya. Ma ha na-echesikwa ọnụ ụzọ ámá nche ike ma ehihie ma abalị ka ha wee gbuo ya.+ 25 Ya mere, ndị na-eso ụzọ ya kpọọrọ ya ma si n’oghere dị ná mgbidi jiri nkata butuo ya n’abalị.+
26 Mgbe ọ bịarutere Jeruselem+ ọ gbalịrị isonyere ndị ahụ na-eso ụzọ; ma ha niile na-atụ ya egwu, n’ihi na ha ekwetaghị na ọ bụ onye na-eso ụzọ. 27 Ya mere, Banabas nyeere ya aka,+ duru ya gakwuru ndịozi, o wee kọọrọ ha n’ụzọ zuru ezu otú ya si hụ Onyenwe anyị n’okporo ụzọ,+ kọọkwara ha na ọ gwara ya okwu,+ nakwa otú ya si kwuo okwu n’atụghị egwu n’aha Jizọs na Damaskọs.+ 28 Ya na ha wee nọrọ, na-ejegharị na Jeruselem n’enweghị ihe mgbochi, na-ekwukwa okwu n’aha Onyenwe anyị n’atụghị egwu;+ 29 ya na ndị Juu ndị na-asụ Grik na-ekwurịtakwa okwu ma na-arụrịta ụka. Ma ndị a nwara igbu ya.+ 30 Mgbe ụmụnna chọpụtara nke a, ha kpọdatara ya Sesaria ma ziga ya Tasọs.+
31 Ya mere, ọgbakọ+ dị na Judia na Galili na Sameria dum banyere n’oge udo, e wee na-ewuli ya elu; ha nọgidekwara na-amụba ka ha na-eje ije n’egwu Jehova,+ na-adịkwa ndụ n’ụzọ kwekọrọ ná nkasi obi ha na-enweta site na mmụọ nsọ.+
32 Ka Pita nọ na-aga n’ebe niile, ọ bịakwutekwara ndị nsọ bi na Lida.+ 33 N’ebe ahụ, ọ hụrụ otu nwoke aha ya bụ Anias, bụ́ onye dina n’ihe ndina ya kemgbe afọ asatọ, n’ihi na ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ. 34 Pita wee sị ya:+ “Anias, Jizọs Kraịst na-agwọ gị.+ Bilie fụkọta ihe ndina gị.” O wee bilie ozugbo ahụ. 35 Ndị niile bi na Lida na mbara ala Sharọn+ hụkwara ya wee chigharịkwuru Onyenwe anyị.+
36 Ma na Jọpa,+ e nwere otu onye na-eso ụzọ Jizọs aha ya bụ Tabita, nke pụtara Dọkas, ma a sụgharịa ya. O jupụtara n’ezi ọrụ+ na onyinye ebere nke ọ na-enye. 37 Ma n’ụbọchị ndị ahụ, ọ dabara na ọ dara ọrịa wee nwụọ. Ya mere, ha sara ya ahụ́ ma dọba ya n’otu ọnụ ụlọ dị n’elu. 38 Ma ebe Lida dị Jọpa+ nso, mgbe ndị na-eso ụzọ Jizọs nụrụ na Pita nọ n’obodo a, ha ziri ndị ikom abụọ ka ha gakwuru ya wee rịọsie ya arịrịọ ike, sị: “Biko, egbula oge ịbịakwute anyị.” 39 Pita wee bilie soro ha gaa. Mgbe ọ bịarutekwara, ha duuru ya gaa n’ọnụ ụlọ ahụ dị n’elu; ndị inyom niile di ha nwụrụ pụtara n’ihu ya na-akwa ákwá ma na-egosi ya ọtụtụ uwe ime na uwe elu+ ndị Dọkas na-akwa mgbe ya na ha nọ.+ 40 Ma Pita mere ka mmadụ niile pụọ n’èzí.+ O gburu ikpere n’ala, kpee ekpere. Mgbe ọ tụgharịrị chee ihu n’ebe ozu ahụ dọ, ọ sịrị: “Tabita, bilie!” O meghere anya ya, ozugbo ọ hụkwara Pita, o biliri nọrọ ọdụ.+ 41 O nyere ya aka ya ma selie ya elu,+ o wee kpọọ ndị nsọ na ndị inyom ahụ di ha nwụrụ ma chee ya n’ihu ha ná ndụ.+ 42 Nke a ghọrọ ihe a maara na Jọpa niile, ọtụtụ ndị ghọkwara ndị kweere n’Onyenwe anyị.+ 43 Ọ nọgidere na Jọpa+ ruo ọtụtụ ụbọchị ya na otu onye bụ́ Saịmọn, onye na-esiji akpụkpọ anụ.+