5 Mgbe nwa oge gasịrị, ada Fero gbadatara ịsa ahụ́ n’Osimiri Naịl, ụmụ nwaanyị na-ejere ya ozi nọkwa na-agagharị n’akụkụ Osimiri Naịl. O wee hụ nkata ahụ n’etiti ahịhịa amị ahụ. O wee ziga ohu ya nwaanyị ozugbo ka o bute ya.+
10 Nwa ahụ wee tolite. O wee kpọrọ ya kpọgara ada Fero, nke mere na ọ ghọrọ nwa ya;+ o wee gụọ ya Mozis wee sị: “Ọ bụ n’ihi na m si na mmiri kupụta ya.”+