10 Ọ ga-erukwa n’ụbọchị ahụ+ na a ga-enwe mgbọrọgwụ Jesi+ nke ga-eguzo ọtọ dị ka ihe mgbaàmà dịịrị ndị dị iche iche.+ Ọ bụkwa ya ka ọbụna mba niile ga-echigharịkwuru ma jụọ ase.+ Ebe izu ike ya ga-adịkwa ebube.+
12 N’ihi na ọ dịghị ihe dị iche n’etiti onye Juu na onye Grik,+ n’ihi na e nwere otu Onyenwe mmadụ niile, onye na-enye ndị niile na-akpọku ya ihe n’ụba.+
9 nakwa ka ndị mba ọzọ+ wee nye Chineke otuto maka ebere ya.+ Dị nnọọ ka e dere, sị: “Ọ bụ ya mere m ga-eji kwupụta gị n’ihu ọha n’etiti ndị mba ọzọ, m ga-abụkwara aha gị abụ olu ụtọ.”+