5 Dị ka ihe atụ, ònye n’ime ndị mmụọ ozi ka ọ gwatụworo, sị: “Ị bụ ọkpara m; mụ onwe m aghọwo nna gị taa”?+ Ònye n’ime ha ka ọ sịkwara: “Mụ onwe m ga-aghọ nna ya, ya onwe ya ga-aghọkwa ọkpara m”?+
5 N’otu ụzọ ahụkwa, Kraịst enyeghị onwe ya otuto+ site n’ịghọ nnukwu onye nchụàjà,+ kama e nyere ya otuto+ site n’ọnụ onye ahụ nke kwuru banyere ya, sị: “Ị bụ ọkpara m; mụ onwe m aghọwo nna gị+ taa.”