10 “‘Ma onye ọ bụla nke si n’ụlọ Izrel ma ọ bụ onye mbịarambịa nke bi dị ka ọbịa n’etiti unu nke riri ụdị ọbara ọ bụla,+ m ga-eche ihu m megide mkpụrụ obi ahụ+ riri ọbara, m ga-ebipụ ya n’etiti ndị ya.
32 Ndị Izrel wee jiri anyaukwu na-amaburu ihe a kwatara n’agha,+ na-akpụrụ atụrụ na ehi na ụmụ ehi ma na-egbu ha n’ala nkịtị, ndị Izrel wee malite irikọta ha na ọbara ha.+