10 Ya mere, ọ bụrụhaala na anyị nwere oge dị mma maka ya,+ ka anyị na-eme ihe ọma n’ebe mmadụ niile nọ, ma karịsịa, n’ebe ndị ezinụlọ anyị n’okwukwe nọ.+
10 N’ihi na ọ bụ ya mere anyị ji na-arụsi ọrụ ike, na-adọgbukwa onwe anyị n’ọrụ,+ n’ihi na anyị nwere olileanya+ n’ebe Chineke dị ndụ nọ, onye bụ́ Onye Nzọpụta+ nke ụdị mmadụ niile,+ karịsịa nke ndị kwesịrị ntụkwasị obi.+
7 ka okwukwe unu nke a nwalere anwale,+ nke bara oké uru karịa ọlaedo nke na-ala n’iyi, n’agbanyeghị na e ji ọkụ nụchaa ya,+ wee bụrụ ihe na-eweta otuto na ebube na nsọpụrụ mgbe a ga-ekpughe+ Jizọs Kraịst.