Ndị Rom 14:1 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 14 Nabatanụ onye okwukwe ya na-esighị ike,+ ma ọ bụghị ime mkpebi banyere ajụjụ ndị dị ya n’obi.+ Ndị Galeshia 6:1 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 6 Ụmụnna m, ọ bụrụgodị na mmadụ azọhie ụkwụ+ tupu ya amara na ọ zọhiere ụkwụ, unu ndị ruru eru n’ụzọ ime mmụọ,+ gbalịanụ iji mmụọ dị nwayọọ+ gbazie onye ahụ. Ka onye ọ bụla n’ime unu lekwasị onwe ya anya,+ a dịghị ama ama, a nwaakwa onye ahụ.+ Ndị Galeshia 6:2 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 2 Na-eburịtanụ ibu arọ+ nke ibe unu, ma si otú a na-emezu iwu nke Kraịst.+ 1 Ndị Tesalonaịka 5:14 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 14 N’aka nke ọzọ, anyị na-agba unu ume, ụmụnna anyị, na-adụnụ ndị na-adịghị agazi agazi ọdụ,+ na-agụgụnụ mkpụrụ obi dara mbà,+ na-akwadonụ ndị na-adịghị ike, na-enwenụ ogologo ntachi obi+ n’ebe mmadụ niile nọ.
6 Ụmụnna m, ọ bụrụgodị na mmadụ azọhie ụkwụ+ tupu ya amara na ọ zọhiere ụkwụ, unu ndị ruru eru n’ụzọ ime mmụọ,+ gbalịanụ iji mmụọ dị nwayọọ+ gbazie onye ahụ. Ka onye ọ bụla n’ime unu lekwasị onwe ya anya,+ a dịghị ama ama, a nwaakwa onye ahụ.+
14 N’aka nke ọzọ, anyị na-agba unu ume, ụmụnna anyị, na-adụnụ ndị na-adịghị agazi agazi ọdụ,+ na-agụgụnụ mkpụrụ obi dara mbà,+ na-akwadonụ ndị na-adịghị ike, na-enwenụ ogologo ntachi obi+ n’ebe mmadụ niile nọ.