15 N’ihi na unu anataghị mmụọ nke ịnọ n’ohu, nke na-akpata egwu+ ọzọ, kama unu natara mmụọ+ nke ịbụ ndị e doro+ dị ka ụmụ, bụ́ mmụọ nke anyị sitere na ya na-eti mkpu, sị: “Aba,+ Nna!”
5Ọ bụ n’ihi nnwere onwe dị otú ahụ ka Kraịst mere ka anyị nwere onwe anyị.+ Ya mere, guzosienụ ike,+ unu ekwekwala ka e jichie unu ọzọ na yok nke ịnọ n’ohu.+
13 Otú ọ dị, ụmụnna m, a kpọrọ unu ka unu nwere onwe unu;+ ma unu ejila nnwere onwe a mere ihe na-akpali anụ ahụ́,+ kama werenụ ịhụnanya na-agbara ibe unu ohu.+