10 Ma ọ tọrọ Jehova ụtọ igwepịa ya.+ O mere ka ọ rịa ọrịa.+ Ọ bụrụ na ị ga-eme ka mkpụrụ obi ya bụrụ àjà ikpe ọmụma,+ ọ ga-ahụ ụmụ ya,+ ọ ga-emekwa ka ụbọchị ya dị ogologo.+ Ihe na-atọ Jehova ụtọ+ ga-aga nke ọma+ n’aka ya.
28 Dị nnọọ ka Nwa nke mmadụ bịara, ọ bụghị ka e jeere ya ozi, kama ka o jee ozi,+ ka o nyekwa mkpụrụ obi ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.”+