1 Timoti
2 Ya mere, ihe mbụ m na-adụsi ọdụ ike ka e mee bụ ka a na-arịọsi arịrịọ ike, na-ekpe ekpere,+ na-arịọchitere ndị ọzọ arịrịọ, na-enyekwa ekele maka ụdị mmadụ niile,+ 2 maka ndị eze+ na ndị niile nọ n’ọkwá dị elu;+ ka anyị wee na-ebi ndụ dị nwayọọ na nke dị jụụ ná nsọpụrụ Chineke zuru ezu na iji ihe kpọrọ ihe.+ 3 Nke a dị mma, bụrụkwa ihe a na-anabata+ n’anya Onye Nzọpụta anyị, bụ́ Chineke,+ 4 onye ọ bụ uche ya ka a zọpụta+ ụdị mmadụ niile,+ ka ha nwetakwa ezi ihe ọmụma+ nke eziokwu.+ 5 N’ihi na e nwere otu Chineke,+ na otu onye ogbugbo+ n’etiti Chineke+ na mmadụ,+ onye bụ́ mmadụ, ya bụ, Kraịst Jizọs,+ 6 onye nyere onwe ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta kwekọrọ ekwekọ maka mmadụ niile+—nke a bụ ihe a ga-agba àmà ya n’oge nke ya. 7 Ọ bụ n’ihi ịgba àmà a+ ka e ji họpụta m ịbụ onye nkwusa na onyeozi,+ onye ozizi nke ndị mba ọzọ+ n’ihe banyere okwukwe+ na eziokwu—eziokwu ka m na-ekwu,+ ọ bụghị ụgha ka m na-agha.
8 Ya mere, n’ebe niile, achọrọ m ka ọ bụrụ ụmụ nwoke na-ekpe ekpere, na-eweli aka na-eguzosi ike n’ihe,+ n’abụghị n’ọnụma+ na nrụrịta ụka.+ 9 Otú ahụkwa, achọrọ m ka ụmụ nwaanyị jiri uwe dị mma n’anya na-achọ onwe ha mma n’imeru ihe n’ókè+ na uche zuru okè, ọ bụghị ịkpa ụdị isi dị iche iche na iji ọlaedo ma ọ bụ nkume pel chọọ onwe ha mma, ma ọ̀ bụ iji ejiji dị nnọọ oké ọnụ,+ 10 kama n’ụzọ kwesịrị ụmụ nwaanyị ndị na-ekwupụta na ha na-asọpụrụ Chineke,+ ya bụ, site n’ezi ọrụ.+
11 Ka nwaanyị na-amụta ihe n’ekwughị okwu, na-edo onwe ya n’okpuru ndị ikom n’ụzọ zuru ezu.+ 12 Enyeghị m nwaanyị ikike izi ihe,+ ma ọ bụ inwe ikike n’ebe nwoke nọ,+ kama ka ọ na-agbachi nkịtị. 13 N’ihi na ọ bụ Adam ka e bu ụzọ kpụọ, e mesịa kpụọ Iv.+ 14 Ọ bụghịkwa Adam ka a ghọgburu,+ kama ọ bụ nwaanyị ahụ ka a ghọgburu kpamkpam,+ o wee mebie iwu.+ 15 Otú ọ dị, a ga-echebe ya site n’ịmụ nwa,+ ma ọ bụrụhaala na ha anọgide n’okwukwe na ịhụnanya na ịdị nsọ, tinyere uche zuru okè.+