4 Nọgidenụ n’ime m, mụ onwe m ga-anọgidekwa n’ime unu.+ Dị nnọọ ka alaka ahụ na-apụghị ịmị mkpụrụ n’onwe ya ma ọ bụrụ na ọ dịgideghị n’osisi vaịn ahụ, otú ahụkwa ka unu na-apụghị ịmị mkpụrụ, ma ọ bụrụ na unu anọgideghị n’ime m.+
5 Abụ m osisi vaịn ahụ, unu bụ alaka ya. Onye nọgidere n’ime m, mụ onwe m anọgidekwa n’ime ya, ọ na-amị mkpụrụ dị ukwuu;+ n’ihi na e wezụga m, unu apụghị ime ihe ọ bụla ma ọlị.