Jọn
15 “Abụ m ezi osisi vaịn,+ ọ bụkwa Nna m kụrụ ya.+ 2 Ọ na-ewepụ alaka ọ bụla dị na m nke na-adịghị amị mkpụrụ,+ nke ọ bụla na-amị mkpụrụ ka ọ na-eme ka ọ dị ọcha,*+ ka o wee na-amịkwu mkpụrụ.+ 3 Unu adịworị ọcha n’ihi okwu m gwara unu.+ 4 Nọgidenụ n’ime m, mụ onwe m ga-anọgidekwa n’ime unu.+ Dị nnọọ ka alaka ahụ na-apụghị ịmị mkpụrụ n’onwe ya ma ọ bụrụ na ọ dịgideghị n’osisi vaịn ahụ, otú ahụkwa ka unu na-apụghị ịmị mkpụrụ, ma ọ bụrụ na unu anọgideghị n’ime m.+ 5 Abụ m osisi vaịn ahụ, unu bụ alaka ya. Onye nọgidere n’ime m, mụ onwe m anọgidekwa n’ime ya, ọ na-amị mkpụrụ dị ukwuu;+ n’ihi na e wezụga m, unu apụghị ime ihe ọ bụla ma ọlị. 6 Ọ bụrụ na onye ọ bụla anọgideghị n’ime m, a na-atụpụ ya dị ka alaka, ọ na-akpọnwụkwa; ndị mmadụ na-achịkọtakwa alaka ndị ahụ ma wụba ha n’ime ọkụ, ha ewee ree ọkụ.+ 7 Ọ bụrụ na unu anọgide n’ime m, okwu m adịgidekwa n’ime unu, rịọnụ ihe ọ bụla unu chọrọ, ọ ga-emekwara unu.+ 8 A na-enye Nna m otuto na nke a, ka unu na-amị mkpụrụ dị ukwuu, unu ewee bụrụ ndị na-eso ụzọ m.+ 9 Dị nnọọ ka Nna m hụrụ m n’anya,+ mụ onwe m ahụkwa unu n’anya, nọgidenụ n’ịhụnanya m. 10 Ọ bụrụ na unu edebe ihe m nyere n’iwu,+ unu ga-anọgide n’ịhụnanya m, dị nnọọ ka m debere ihe Nna m+ nyere n’iwu wee nọgide n’ịhụnanya ya.
11 “Ihe ndị a ka m gwara unu, ka ọṅụ m wee dịrị n’ime unu, ka e wee mee ka ọṅụ unu zuo ezu.+ 12 Nke a bụ ihe m nyere n’iwu, ka unu na-ahụrịta ibe unu n’anya dị nnọọ ka m hụrụ unu n’anya.+ 13 Ọ dịghị onye nwere ịhụnanya karịrị nke a, na mmadụ ga-atọgbọ mkpụrụ obi ya n’ihi ndị enyi ya.+ 14 Unu bụ ndị enyi m ma ọ bụrụ na unu emee ihe m na-enye unu n’iwu.+ 15 Adịkwaghị m akpọ unu ndị ohu, n’ihi na ohu adịghị ama ihe nna ya ukwu na-eme. Kama ana m akpọ unu ndị enyi m,+ n’ihi na ihe niile m nụrụ n’ọnụ Nna m ka m mere ka unu mara.+ 16 Ọ bụghị unu họọrọ m, kama ọ bụ m họọrọ unu, m họpụtakwara unu ka unu gaa n’ihu wee na-amị mkpụrụ,+ ka mkpụrụ unu wee dịgidekwa; ka Nna m wee nye unu ihe ọ bụla unu rịọrọ ya n’aha m, ihe ọ sọkwara ya bụrụ.+
17 “Ihe ndị a ka m na-enye unu n’iwu, ka unu na-ahụrịta ibe unu n’anya.+ 18 Ọ bụrụ na ụwa akpọọ unu asị, maranụ na ọ kpọwo m asị tupu ya akpọọ unu asị.+ 19 A sị na unu bụ nke ụwa, ụwa gaara ahụ ihe bụ́ nke ya n’anya.+ Ma n’ihi na unu abụghị nke ụwa,+ kama ahọpụtara m unu n’ụwa, ọ bụ ya mere ụwa ji kpọọ unu asị.+ 20 Chetanụ okwu m gwara unu, Ohu adịghị aka nna ya ukwu. Ọ bụrụ na ha akpagbuwo m, ha ga-akpagbukwa unu;+ ọ bụrụ na ha edebewo okwu m, ha ga-edebekwa nke unu. 21 Ma ha ga-eme unu ihe ndị a niile n’ihi aha m, n’ihi na ha amaghị onye ahụ nke zitere m.+ 22 A sị na mụ abịaghị gwa ha okwu, ha agaraghị enwe mmehie;+ ma ugbu a, ha enweghị ihe ha ga-eji gọpụ onwe ha ná mmehie ha.+ 23 Onye kpọrọ m asị kpọkwara Nna m asị.+ 24 A sị na mụ arụghị ọrụ ndị ahụ n’etiti ha, bụ́ nke onye ọ bụla ọzọ na-arụghị,+ ha agaraghị enwe mmehie;+ ma ugbu a, ha ahụwo m, kpọọkwa mụ na Nna m asị.+ 25 Kama ọ bụ ka e wee mezuo okwu ahụ e dere n’Iwu ha, nke sịrị, ‘Ha kpọrọ m asị na nkịtị.’+ 26 Mgbe ihe inyeaka ahụ rutere, nke m ga-esi n’ebe Nna m nọ zitere unu,+ bụ́ mmụọ nke eziokwu ahụ, nke na-esi n’ebe Nna m nọ abịa, ọ ga-agba àmà banyere m;+ 27 unu onwe unu ga-agbakwa àmà,+ n’ihi na mụ na unu nọ site na mgbe m malitere.