26 Ọ bụrụ na onye ọ bụla ga-ejere m ozi, ya sowe m, ebe m nọ ka onye ozi m ga-anọkwa.+ Ọ bụrụ na onye ọ bụla ga-ejere m ozi, Nna m ga-eme ka o nwee ùgwù.+
24 Nna, banyere ihe i nyere m, ọ dị m ka ya bụrụ na ha onwe ha ga-eso m nọrọ n’ebe m nọ,+ ka ha wee hụ ebube i nyere m, n’ihi na ị hụrụ m n’anya tupu a tọọ ntọala+ ụwa.+