7 Olee onye jetụworo ozi dị ka onye agha site n’akpa nke ya onwe ya? Olee onye na-akọ ubi vaịn nke na-adịghị eri mkpụrụ ya?+ Ma ọ bụ, olee onye na-azụ anụ ụlọ nke na-adịghịkwa aṅụ mmiri ara nke si n’anụ ụlọ ahụ?+
10 Ka ọ̀ bụ naanị n’ihi anyị ka o ji na-ekwu ya? N’ezie, ọ bụ n’ihi anyị ka e ji dee ya,+ n’ihi na onye na-akọ ubi kwesịrị ịkọ ubi ma nwee olileanya, onye na-azọchakwa mkpụrụ kwesịrị ime otú ahụ ma nwee olileanya na ya ga-eri ya.+