11 Na-emekwanụ otú a, n’ihi na unu maara oge ahụ a kara aka, na oge awa ahụ eruwo ka unu teta n’ụra,+ n’ihi na nzọpụta anyị dị nso ugbu a karịa mgbe anyị ghọrọ ndị kwere ekwe.+
12 na-echere+ ma na-eburu ọbịbịa* nke ụbọchị Jehova n’uche,+ nke ga-eme ka eluigwe ree ọkụ wee gbazee,+ ihe ndị dị n’eluigwe na ụwa ga-adịkwa oké ọkụ wee gbazee!