2 Pita
3 Ndị m hụrụ n’anya, nke a bụ akwụkwọ ozi nke abụọ m na-edetara unu ugbu a, bụ́ nke m ji na-akpali ezi ikike iche echiche unu site n’ichetara unu ihe,+ dị ka m mere na nke mbụ m dere,+ 2 ka unu wee cheta okwu ndị e kwuru na mbụ site n’ọnụ ndị amụma dị nsọ+ na ihe Onyenwe anyị na Onye Nzọpụta anyị nyere n’iwu site n’ọnụ ndịozi unu.+ 3 N’ihi na unu bu ụzọ mara nke a, na n’oge ikpeazụ,+ ndị na-akwa emo ga-eji ịkwa emo ha bịa,+ na-agbaso ọchịchọ nke onwe ha,+ 4 na-asị:+ “Olee ebe nkwa a nke ọnụnọ ya dị?+ Leenụ, site n’ụbọchị nna nna anyị hà dara n’ụra ọnwụ, ihe niile ka dị kpọmkwem otú ha dị site ná mmalite okike.”+
5 N’ihi na, dị ka ha si chọọ, ha na-echezọ eziokwu a, na e nwere eluigwe+ nke dị site n’oge ochie na ala kpụkọrọ ọnụ nke si na mmiri pụta+ ma guzoro n’etiti mmiri+ site n’okwu Chineke; 6 e jikwa ihe ndị ahụ bibie ụwa nke oge ahụ mgbe e mere ka iju mmiri rikpuo ya.+ 7 Ma site n’otu okwu ahụ, eluigwe+ na ụwa+ dị ugbu a ka e debeere ọkụ,+ a na-edebekwa ha ruo ụbọchị ikpe+ na ụbọchị mbibi nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke.+
8 Otú ọ dị, ka unu ghara ichezọ otu eziokwu a, ndị m hụrụ n’anya, na otu ụbọchị dị ka otu puku afọ n’anya Jehova, otu puku afọ dịkwa ka otu ụbọchị.+ 9 Jehova adịghị egbu oge n’imezu nkwa ya,+ dị ka ụfọdụ ndị si ewere igbu oge, kama ọ na-enwere unu ndidi n’ihi na ọ chọghị ka e bibie onye ọ bụla, kama ọ chọrọ ka mmadụ niile chegharịa.+ 10 Ma ụbọchị Jehova+ ga-abịa dị ka onye ohi,+ bụ́ mgbe eluigwe ga-eji oké ụzụ+ gabiga,+ ma ihe ndị dị n’eluigwe na ụwa ga-adị oké ọkụ wee gbazee,+ a ga-ekpughekwa ụwa+ na ọrụ ndị a rụrụ n’ime ya.+
11 Ebe a ga-esi otú a gbazee ihe ndị a niile, chebaranụ ụdị mmadụ unu kwesịrị ịbụ echiche n’ihe banyere àgwà dị nsọ na omume ịsọpụrụ Chineke, 12 na-echere+ ma na-eburu ọbịbịa* nke ụbọchị Jehova n’uche,+ nke ga-eme ka eluigwe ree ọkụ wee gbazee,+ ihe ndị dị n’eluigwe na ụwa ga-adịkwa oké ọkụ wee gbazee! 13 Ma e nwere eluigwe ọhụrụ+ na ụwa ọhụrụ+ anyị na-echere dị ka nkwa ya si dị, ezi omume ga-ebikwa n’ime ha.+
14 Ya mere, ndị m hụrụ n’anya, ebe unu na-echere ihe ndị a, gbalịsienụ ike ka o wee hụ unu n’ikpeazụ dị ka ndị na-enweghị ntụpọ+ na ndị na-enweghị mmerụ na ndị nọ n’udo.+ 15 Na-agụkwanụ ndidi Onyenwe anyị dị ka nzọpụta, dị nnọọ ka nwanna anyị a hụrụ n’anya bụ́ Pọl detakwaara unu akwụkwọ,+ dị ka amamihe+ nke e nyere ya si dị, 16 na-ekwu banyere ihe ndị a dị ka ọ na-ekwukwa n’akwụkwọ ozi ya niile. Otú ọ dị, e nwere ihe ụfọdụ n’ime ha siri ike nghọta, bụ́ nke ndị a na-ezighị ihe na ndị na-akwụsighị ike na-agbagọ, dị ka ha na-emekwa ihe ndị ọzọ e dere n’Akwụkwọ Nsọ,+ iwetara onwe ha mbibi.
17 Ya mere, ndị m hụrụ n’anya, ebe unu bu ụzọ mara ihe ndị a,+ kpacharanụ anya ka a ghara idufu unu na ha site ná njehie nke ndị na-eleda iwu anya, unu ewee kwụsị iguzosi ike.+ 18 Ee e, kama na-etonụ eto n’obiọma na-erughịrị mmadụ nakwa n’ihe ọmụma banyere Onyenwe anyị na Onye Nzọpụta anyị bụ́ Jizọs Kraịst.+ Ka otuto dịrị ya ugbu a, ruokwa ụbọchị nke mgbe ebighị ebi.+