6 Mmụọ Jehova wee malite ịkpa ike n’ahụ́ ya,+ o wee dọwaa ya abụọ, dị nnọọ ka mmadụ si adọwa nwa mkpi, o jighịkwa ihe ọ bụla n’aka. Ọ gwaghịkwa nna ya na nne ya ihe o mere.
34 Devid wee sị Sọl: “Ohu gị ghọrọ onye na-azụ ìgwè atụrụ nna ya, otu ọdụm wee bịa,+ otu anụ ọhịa bea bịakwara, nke ọ bụla buuru otu atụrụ n’ìgwè atụrụ ahụ.