13 Ya mere, ọ bụrụ na unu maara otú e si enye ụmụ unu ezi onyinye,+ ọ bụ ezie na unu bụ ndị ajọ omume, lee ka Nna unu nke nọ n’eluigwe ga-esi nye ndị na-arịọ ya mmụọ nsọ+ karị!”
26 Otú ahụkwa, mmụọ nsọ+ na-enyekwara anyị aka n’adịghị ike anyị;+ n’ihi na anyị amaghị nsogbu nke anyị kwesịrị ikpe ekpere maka ya dị ka ọ dị anyị mkpa ịdị na-ekpe,+ ma mmụọ nsọ+ n’onwe ya na-arịọrọ anyị arịrịọ mgbe anyị na-asụ ude n’ekwughị okwu.
18 ka unu ji ụdị ikpe ekpere+ ọ bụla na ụdị ịrịọsi arịrịọ ike ọ bụla na-anọgide n’ekpere n’oge niile n’ime mmụọ nsọ.+ Iji mee nke ahụ, mụrụnụ anya mgbe niile, na-arịọsikwanụ arịrịọ ike n’ihi ndị nsọ niile,