25 Ka nke a na-eme, o mere ka ndị Livaị+ jiri ájà+ na ụbọ akwara+ na une+ guzoro n’ụlọ Jehova, dị ka Devid+ na Gad+ bụ́ onye ọhụụ eze nakwa Netan+ onye amụma nyere n’iwu, n’ihi na ọ bụ Jehova nyere iwu ahụ site n’ọnụ ndị amụma ya.+
2 M wee hụ ihe dị ka oké osimiri yiri enyo,+ nke ya na ọkụ gwakọtara, hụkwa ndị meriri+ anụ ọhịa ahụ na onyinyo ya+ na nọmba+ nke aha ya ka ha guzo n’akụkụ oké osimiri ahụ yiri enyo,+ ha ji ụbọ akwara+ nke Chineke n’aka.