8 Ha wee sị ya: “Anyị abụọ n’otu n’otu rọrọ nrọ, ma e nweghị onye na-akọwa nrọ anyị na ya nọ.” Josef sịziri ha: “Ọ̀ bụ na ọ bụghị Chineke na-akọwa nrọ?+ Biko, kọọrọnụ m ya.”
28 Ma, e nwere Chi nọ n’eluigwe, Onye na-eme ka a mata ihe nzuzo.+ O meekwala ka Eze Nebukadneza mara ihe ga-eme n’oge ikpeazụ. Ihe a bụ nrọ ị rọrọ na ọhụụ ị hụrụ mgbe i dina n’àkwà* gị: