Abụ Ọma 27:1 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 27 Jehova bụ ìhè m+ na onye na-azọpụta m. Ònye ka m ga-atụ egwu?+ Jehova bụ idé ji ndụ m.+ Ònye ka m ga-atụ ụjọ? Aịzaya 41:10 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 10 Atụla egwu, n’ihi na m nọnyeere gị.+ Echegbula onwe gị, n’ihi na abụ m Chineke gị.+ M ga-eme ka ị dị ike. M ga-enyekwara gị aka.+ M ga-eji aka nri m, bụ́ aka m ji eme ihe ziri ezi, jidesie gị ike.’ Ndị Rom 8:31 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 31 Gịnịzi ka anyị ga-ekwu banyere ihe ndị a? Ọ bụrụ na Chineke nọnyeere anyị, ònye ga-emegide anyị?+ Ndị Hibru 13:6 Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ 6 Ka anyị wee nwee obi ike ma sị: “Jehova* bụ onye na-enyere m aka. Agaghị m atụ egwu. Gịnị ka mmadụ ga-emeli m?”+
27 Jehova bụ ìhè m+ na onye na-azọpụta m. Ònye ka m ga-atụ egwu?+ Jehova bụ idé ji ndụ m.+ Ònye ka m ga-atụ ụjọ?
10 Atụla egwu, n’ihi na m nọnyeere gị.+ Echegbula onwe gị, n’ihi na abụ m Chineke gị.+ M ga-eme ka ị dị ike. M ga-enyekwara gị aka.+ M ga-eji aka nri m, bụ́ aka m ji eme ihe ziri ezi, jidesie gị ike.’
6 Ka anyị wee nwee obi ike ma sị: “Jehova* bụ onye na-enyere m aka. Agaghị m atụ egwu. Gịnị ka mmadụ ga-emeli m?”+