11 Ma, Fero kpọkọtara ndị ma ihe na ndị dibịa afa. Ndị dibịa anwansi ndị a e nwere n’Ijipt+ jikwa anwansi* ha mee otu ihe ahụ.+12 Onye ọ bụla n’ime ha tụpụrụ mkpara ya n’ala, mkpara ya aghọọ nnukwu agwọ. Ma mkpara Erọn loro mkpara ha.
20 Ozugbo ahụ, Mosis na Erọn mere nnọọ otú Jehova nyere ha iwu. O weliri mkpara ahụ kụọ mmiri dị n’Osimiri Naịl n’ihu Fero na ndị na-ejere ya ozi, mmiri niile dị n’osimiri ahụ ghọziri ọbara.+
18 Ndị dibịa anwansi gbalịrị ka ha jiri anwansi* ha mee otu ihe ahụ, ka anwụnta pụta,+ ma ha emelighị ya. Anwụnta ndị ahụ wee ju n’ahụ́ ndị mmadụ nakwa n’ahụ́ ụmụ anụmanụ.
8 Ọ bụ otú Janis na Jambris si megide Mosis ka ndị a* si emegide eziokwu. Uche ha rụrụ arụ kpamkpam. Ihe ha anaghịkwa amasị Chineke n’ihi na ha na-eme ihe dị iche n’ihe Ndị Kraịst kweere.