-
Diuterọnọmi 8:7-9Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
-
-
7 N’ihi na Jehova bụ́ Chineke unu na-akpọbata unu n’ezigbo ala,+ ala iyi dị iche iche juru na ya, ebe isi mmiri dị iche iche na mmiri miri emi na-asọpụta n’ala dị larịị, na-asọpụtakwa n’ebe bụ́ ugwu ugwu, 8 ala ọka wit, ọka bali, mkpụrụ vaịn, mkpụrụ fig, pomigranet,+ mmanụ oliv, na mmanụ aṅụ juru na ya,+ 9 ala nri na-agaghị akọ ụkọ na ya, nke a na-enweghịkwa ihe ga-akọ unu na ya, ala nke ígwè juru na nkume ndị dị na ya. Unu ga-egwutekwa ọla kọpa n’ugwu ndị dị na ya.
-