8 M ga-aga ịnapụta ha n’aka ndị Ijipt+ na ịkpọpụta ha n’ala ahụ kpọga ha n’ala dị mma ma dị obosara, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya,*+ bụ́ ala ndị Kenan, ndị Het, ndị Amọraịt, ndị Perizaịt, ndị Haịvaịt, na ndị Jebus.+
24 Ọ bụ ya mere m ji sị unu: “Unu ga-eweghara ala ha. M ga-enyekwa ya unu ka ọ bụrụ nke unu, bụ́ ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.*+ Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu, onye mere ka unu dị iche ná ndị niile ọzọ.”+