8 “Ọ bụrụ na ọrịa ekpenta* arịawa mmadụ, lezienụ anya ka unu mee ihe niile ndị nchụàjà, bụ́ ndị Livaị, ga-agwa unu.+ Lezienụ anya ka unu mee kpọmkwem ihe m nyere ha n’iwu.
7 N’ihi na egbugbere ọnụ onye nchụàjà kwesịrị ịna-akụziri ndị mmadụ gbasara Chineke, ndị mmadụ kwesịkwara ịna-ajụta ya ihe iwu kwuru*+ maka na ọ bụ onye ozi Jehova nke ụsụụ ndị agha.