15 Mosis gwara nna nwunye ya, sị: “Ọ bụ maka na ha na-abịakwute m ka m jụọ Chineke ase. 16 Ha nwee ikpe, ha na-abịakwute m. M na-ekpere otu onye na ibe ya ikpe, m na-emekwa ka a mata ihe ezi Chineke kpebiri nakwa iwu ya.”+
11 Jehova gwara Mosis okwu ihu na ihu+ otú mmadụ si agwa mmadụ ibe ya okwu. Mgbe ọ bụla Mosis gaghachiri n’ebe ndị Izrel mara ụlọikwuu, Joshụa+ nwa Nọn, bụ́ onye ozi ya na onye na-enyere ya aka,+ anaghị esi n’ụlọikwuu ahụ apụ.
11 Nwoke ahụ nne ya bụ onye Izrel malitere ikwutọ aha Chineke* ma kpọọ Chineke iyi.+ E wee kpọgara ya Mosis.+ Aha nne ya bụ Shelomit, nwa Dibraị, onye si n’ebo Dan. 12 Ha jichiri nwoke ahụ ruo mgbe a ga-eme ka ha mata ihe Jehova chọrọ ka ha mee.+