19 N’ihi ya, ókè ala ndị Kenan malitere na Saịdọn ruo Gira,+ n’ebe dị nso na Gaza,+ ruokwa Sọdọm, Gọmọra,+ Adma, na Zeboyim.+ Obodo ndị a dị nso na Lesha.
4 Ọ bụ unu ga-enwe malite n’ala ịkpa ruo ma Lebanọn ma nnukwu osimiri bụ́ Osimiri Yufretis, ya bụ, ala ndị Het+ niile, ruokwa n’Oké Osimiri Mediterenian* dị n’ebe ọdịda anyanwụ.+
14Ihe a bụ ala ndị Izrel ketara n’ala Kenan. Ọ bụ Elieza onye nchụàjà na Joshụa nwa Nọn na ndị isi ọnụmara ọ bụla n’ebo dị iche iche n’Izrel keere ha ya.+
19 M nọ na-eche otú obi si dị m ụtọ iwere gị ka otu n’ime ụmụ m ndị nwoke ma nye gị ọmarịcha ala, ala kacha ala niile mba dị iche iche ketara mma.+ M nọkwa na-eche na ị ga na-akpọ m “Nna m” nakwa na ị gaghị akwụsị iso m.
26 O sikwa n’otu mmadụ+ mee ka mmadụ niile nọ ná mba ọ bụla dịrị, meekwa ka ha biri n’elu ụwa niile.+ O kpebikwara oge ihe dị iche iche ga-eme nakwa ebe ụmụ mmadụ ga-ebi na ebe ha na-agaghị ebi.+